Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.

Daniel 6:9 in English

Daniel 6:9 · Berean Standard Bible

Therefore King Darius signed the written decree.

Context

7Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm. 8Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.” 9Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ. 10Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ. 11Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.