Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọnwa iri na abụọ gafesịrị ọ nọ na-agagharị nʼelu ụlọ dị nʼụlọeze nʼobodo Babilọn.

Daniel 4:29 in English

Daniel 4:29 · Berean Standard Bible

Twelve months later, as he was walking on the roof of the royal palace of Babylon,

Context

27Ya mere, biko eze, kweere nabata ndụmọdụ m, kwụsị ime mmehie, mee ihe ziri ezi, werekwa omume ileta ndị ogbenye dochie nʼọnọdụ ajọ omume gị. Eleghị anya, ihe ga na-agara gị nke ọma.” 28Ma ihe ndị a niile bịakwasịrị eze Nebukadneza. 29Mgbe ọnwa iri na abụọ gafesịrị ọ nọ na-agagharị nʼelu ụlọ dị nʼụlọeze nʼobodo Babilọn. 30Ma eze sịrị, “Ebe a, ọ bụghị Babilọn dị ukwu, nke m wuuru onwe m dịka ebe obibi m, site nʼike m dị ukwu na maka ebube ọchịchị m?” 31Mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, otu olu si nʼeluigwe kwuo okwu, “Ihe a ka e kpebiri megide gị, eze Nebukadneza. Site taa gaa nʼihu ị gaghị abụkwa eze na-achị alaeze a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.