Daniel 3:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.
Daniel 3:11 in English
Daniel 3:11 · Berean Standard Bible
and that whoever does not fall down and worship will be thrown into the blazing fiery furnace.
Context
9Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 10Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ, 11na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. 12Ugbu a, e nwere ụfọdụ ndị Juu, ndị aha ha bụ Shedrak, na Mishak na Abednego, ndị i mere ka ha bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn; ha aṅaghị ntị nʼiwu eze nyere, jụkwa ịkpọ isiala nye oyiyi a i ji ọlaedo kpụọ.” 13Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.