Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa eze nyere Daniel ọkwa dị ukwuu, nyekwa ya ọtụtụ onyinye dị iche iche. O mere ya onyeisi na-achị ala Babilọn niile, meekwa ya onyeisi ndị ndụmọdụ eze niile.

Daniel 2:48 in English

Daniel 2:48 · Berean Standard Bible

Then the king promoted Daniel and gave him many generous gifts. He made him ruler over the entire province of Babylon and chief administrator over all the wise men of Babylon.

Context

46Mgbe ahụ, eze Nebukadneza dara nʼala nʼihu Daniel nye ya nsọpụrụ. O nyekwara iwu ka eweta onyinye na ụda na-esi isi ụtọ were chụnyere ya aja. 47Onye eze gwakwara Daniel, “Nʼezie, Chineke gị bụ Chineke kachasị chi niile. Ọ bụ ya na-achị eze niile bi nʼụwa, bụrụkwa Onye na-ekpughepụ ihe omimi niile, nʼihi na lee, i nwere ike ịkọwa ihe omimi nke a.” 48Emesịa eze nyere Daniel ọkwa dị ukwuu, nyekwa ya ọtụtụ onyinye dị iche iche. O mere ya onyeisi na-achị ala Babilọn niile, meekwa ya onyeisi ndị ndụmọdụ eze niile. 49Ma dịka Daniel siri rịọ eze, o mekwara ka Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn, Daniel nʼonwe ya nọdụrụ nʼogige eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.