Daniel 2:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe e kwupụtara iwu onye eze ka e gbuo ndị oke amamihe niile, ndị agha chọkwara ebe Daniel na ndị otu ya nọ ka ha gbuo ha.
Daniel 2:13 in English
Daniel 2:13 · Berean Standard Bible
So the decree went out that the wise men were to be executed, and men went to look for Daniel and his friends to execute them.
Context
11Ihe a ị chọrọ ka anyị mee bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ọ bụ naanị ndị mmụọ nwere ike ịkọrọ gị ihe ị rọrọ na nrọ. Ndị mmụọ anọkwaghị nʼetiti ndị mmadụ.” 12Nke a mere ka eze jupụta nʼoke iwe na ọnụma, o nyere iwu ka e gbuchaa ndị amamihe niile nke Babilọn. 13Mgbe e kwupụtara iwu onye eze ka e gbuo ndị oke amamihe niile, ndị agha chọkwara ebe Daniel na ndị otu ya nọ ka ha gbuo ha. 14Mgbe Ariok, onye bụ onyeisi ndị nche eze pụrụ igbu ndị ikom maara ihe na Babilọn, Daniel ji amamihe na ezi uche gwa ya okwu. 15Ọ jụrụ onyeozi eze, bụ Ariok, “Gịnị mere eze ji nye iwu dị ike dị otu a?” Mgbe ahụ, Ariok kọwaara ihe niile nye Daniel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.