Daniel 11:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼoge ahụ, otu onye ga-esi nʼagbụrụ ụlọ nwanyị ahụ kulite i were ọnọdụ ya ịchị dịka eze, ọ ga-ebuso ndị agha eze mpaghara ugwu agha, bata nʼebe ya e wusiri ike, ọ ga-alụso ha agha ghọọ onye mmeri.
Daniel 11:7 in English
Daniel 11:7 · Berean Standard Bible
But one from her family line * will rise up in his place, come against the army of the king of the North, and enter his fortress, fighting and prevailing.
Context
5“Eze nke ndịda ga-adị ike, ma otu onye nʼime ndịisi agha ya ga-adị ike karịa ya, chịakwa alaeze dị ukwu karịa nke ya 6Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ha ga-ekekọta onwe ha. Ada eze ndịda ga-agakwuru eze ugwu ka ha gbaa ndụ, ma ada eze agaghị ejigide ike ya, eze na ike ya agaghị adịgidekwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, a ga-arara ada eze ahụ nye, ya na ndị na-eche ya nche, na nna* ya na onye ahụ dịnyeere ya. 7“Nʼoge ahụ, otu onye ga-esi nʼagbụrụ ụlọ nwanyị ahụ kulite i were ọnọdụ ya ịchị dịka eze, ọ ga-ebuso ndị agha eze mpaghara ugwu agha, bata nʼebe ya e wusiri ike, ọ ga-alụso ha agha ghọọ onye mmeri. 8Ọ ga-ebukọrọ chi ha niile na arụsị ha niile awụrụ awụ ma ndị atụrụ atụ, na ihe ndị ọzọ dịkarịsịrị ha mkpa dịka efere, ọlaọcha na nke ọlaedo laa Ijipt. O mechaa nke a, ọ ga-akwụsị ịlụso eze ugwu ọgụ afọ ole na ole. 9Otu a kwa, eze mpaghara ugwu ga-ebuso eze ndịda agha, ma ọ gaghị anọ ọdụ lọghachikwa nʼala nke ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.