Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe o merichara ndị agha ahụ, ọ ga-enwe ọṅụ dị ukwu, ọ ga-egbukwa imerime puku ndị mmadụ, ma ọ gaghị emeri na-aga nʼihu.

Daniel 11:12 in English

Daniel 11:12 · Berean Standard Bible

When the army is carried off, the king of the South will be proud in heart and will cast down tens of thousands, but he will not triumph.

Context

10Ma ụmụ ya ndị ikom ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha siri ike, ndị ga-enupu dịka oke idee mmiri, buru agha ruo nʼebe ya e wusiri ike. 11“Mgbe ahụ, eze ndịda, onye iwe ga-eju obi, ga-achịkọtakwa ndị agha nke ya buso eze ugwu agha, onye nke ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha, ma ndị a ka ndị iro ya ga-alụgbu. 12Ma mgbe o merichara ndị agha ahụ, ọ ga-enwe ọṅụ dị ukwu, ọ ga-egbukwa imerime puku ndị mmadụ, ma ọ gaghị emeri na-aga nʼihu. 13Mgbe afọ ole na ole gafere, eze ndị mpaghara ugwu ga-eduru ndị agha ji ezi ngwa agha, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ karịa ndị nke e meriri nʼagha na mbụ pụọ ibu agha. 14“Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị ga-ebili imegide eze ndịda, Ụfọdụ ndị ọkpa aghara nʼetiti unu ga-enupukwa isi, ha ga-esi otu a mezuo ihe a ị hụrụ nʼọhụ, ma a ga-emeri ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.