Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa;

Daniel 10:20 in English

Daniel 10:20 · Berean Standard Bible

“Do you know why I have come to you?” he said. “I must return at once to fight against the prince of Persia, and when I have gone forth, behold, the prince of Greece * will come.

Context

18Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike. 19Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.” Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.” 20Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa; 21ma otu ọ dị, aga m agwa gị ihe e dere nʼakwụkwọ nke eziokwu. (Ọ dịghị onye na-enyere m aka imegide ha ma ọ bụghị naanị Maikel onyeisi unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.