Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.

Daniel 1:7 in English

Daniel 1:7 · Berean Standard Bible

The chief official gave them new names: To Daniel he gave the name Belteshazzar; to Hananiah, Shadrach; to Mishael, Meshach; and to Azariah, Abednego.

Context

5Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze. 6Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda. 7Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego. 8Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya. 9Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.