Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ.

Daniel 1:15 in English

Daniel 1:15 · Berean Standard Bible

And at the end of ten days, they looked healthier and better nourished than all the young men who were eating the king’s food.

Context

13Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.” 14O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri. 15Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ. 16Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri. 17Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.