Ndị Kọlọsị 1:26
Colossians 1:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke.
Colossians 1:26 in English
Colossians 1:26 · Berean Standard Bible
the mystery that was hidden for ages and generations but is now revealed to His saints.
Context
24Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị. 25Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya. 26Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. 27Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ. 28Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.