Emọs 6:5
Amos 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.
Amos 6:5 in English
Amos 6:5 · Berean Standard Bible
You improvise songs on the harp like David and invent your own musical instruments.
Context
3Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ
ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa. 4Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi,
na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha,
na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma
na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba. 5Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara,
ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere. 6Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba;
na-ete mmanụ makarịsịrị mma,
ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha. 7Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ.
Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.