Ọrụ Ndị Ozi 7:8
Acts 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.
Acts 7:8 in English
Acts 7:8 · Berean Standard Bible
Then God gave Abraham the covenant of circumcision, and Abraham became the father of Isaac and circumcised him on the eighth day. And Isaac became the father of Jacob, and Jacob of the twelve patriarchs.
Context
6Ma Chineke gwara ya otu a, na, ‘Ụmụ ụmụ ya ga-ebi dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha, ndị ga-eji ha mere ohu, ma mejọọkwa ha narị afọ anọ. 7Mana aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ.’* Chineke kwukwara sị, ‘Mgbe nke a gasịrị, ha ga-esi na mba ahụ pụta, bịa fee m ofufe nʼebe a.’* 8O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel. 9“Nʼihi na ndị nna ochie ahụ nwere ekworo nʼebe Josef nọ. Ha resi ya ndị Ijipt dịka ohu. Ma Chineke nọnyeere ya, 10zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.