Ọrụ Ndị Ozi 7:45
Acts 7:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.
Acts 7:45 in English
Acts 7:45 · Berean Standard Bible
And our fathers who received it brought it in with Joshua when they dispossessed the nations God drove out before them. It remained until the time of David,
Context
43Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk
na kpakpando nke chi unu bụ Refan,
bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha.
Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’* 44“Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis. 45Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid. 46Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi. 47Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.