Native Bible

Acts 4:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.

Acts 4:28 in English

Acts 4:28 · Berean Standard Bible

They carried out what Your hand and will had decided beforehand would happen.

Context

26Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’* 27Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ, 28ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu. 29Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla. 30Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.