Ọrụ Ndị Ozi 3:8
Acts 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
Acts 3:8 in English
Acts 3:8 · Berean Standard Bible
He sprang to his feet and began to walk. Then he went with them into the temple courts, walking and leaping and praising God.
Context
6Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.” 7O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike. 8Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke. 9Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke, 10ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.