Ọrụ Ndị Ozi 3:19
Acts 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
Acts 3:19 in English
Acts 3:19 · Berean Standard Bible
Repent, then, and turn back, so that your sins may be wiped away,
Context
17“Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa. 18Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ. 19Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu, 20ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs. 21Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.