Native Bible

Acts 27:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala.

Acts 27:43 in English

Acts 27:43 · Berean Standard Bible

But the centurion, wanting to spare Paul’s life, thwarted their plan. He commanded those who could swim to jump overboard first and get to land.

Context

41Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ. 42Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.* 43Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala. 44Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo. 27:42 Ọ bụrụ na ndị mkpọrọ a gbafuo, a na-egbu ndị agha niile ọ bụ ọrụ ha iledo ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.