Ọrụ Ndị Ozi 27:40
Acts 27:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala.
Acts 27:40 in English
Acts 27:40 · Berean Standard Bible
Cutting away the anchors, they left them in the sea as they loosened the ropes that held the rudders. Then they hoisted the foresail to the wind and made for the beach.
Context
38Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe. 39Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee. 40Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala. 41Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ. 42Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.