Ọrụ Ndị Ozi 27:37
Acts 27:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii.
Acts 27:37 in English
Acts 27:37 · Berean Standard Bible
In all, there were 276 * of us on board.
Context
35Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya. 36Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri. 37Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii. 38Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe. 39Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.