Ọrụ Ndị Ozi 25:3
Acts 25:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ.
Acts 25:3 in English
Acts 25:3 · Berean Standard Bible
to grant them a concession against Paul by summoning him to Jerusalem, because they were preparing an ambush to kill him along the way.
Context
1Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem. 2Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl. 3Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ. 4Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya. 5Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.