Ọrụ Ndị Ozi 25:23
Acts 25:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl.
Acts 25:23 in English
Acts 25:23 · Berean Standard Bible
The next day Agrippa and Bernice came with great pomp and entered the auditorium, along with the commanders and leading men of the city. And Festus ordered that Paul be brought in.
Context
21Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.” 22Agripa gwara Festọs, “Achọrọ m ịnụ okwu site nʼọnụ nwoke a nʼonwe ya.”
Ọ sịrị, “Ị ga-anụ ya echi.” 23Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl. 24Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ. 25Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.