Ọrụ Ndị Ozi 25:10
Acts 25:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma.
Acts 25:10 in English
Acts 25:10 · Berean Standard Bible
Paul replied, “I am standing before the judgment seat of Caesar, where I ought to be tried. I have done nothing wrong to the Jews, as you yourself know very well.
Context
8Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.” 9Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?” 10Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma. 11Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.” 12Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.