Native Bible

Acts 24:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”

Acts 24:25 in English

Acts 24:25 · Berean Standard Bible

As Paul expounded on righteousness, self-control, and the coming judgment, Felix became frightened and said, “You may go for now. When I find the time, I will call for you.”

Context

23O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya. 24Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst. 25Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.” 26Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka. 27Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ. 24:7 Ụfọdụ akwụkwọ edebanyeghị amaokwu nke asaa na ụfọdụ okwu dị nʼamaokwu nke asatọ, ebe sịrị na o nyere iwu ka ndị na-ebo ya ebubo pụta nʼihu nʼihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.