Ọrụ Ndị Ozi 24:15
Acts 24:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
Acts 24:15 in English
Acts 24:15 · Berean Standard Bible
and I have the same hope in God that they themselves cherish, that there will be a resurrection of both the righteous and the wicked.
Context
13Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m. 14Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma. 15Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị. 16Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile. 17“Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.