Ọrụ Ndị Ozi 21:37
Acts 21:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik?
Acts 21:37 in English
Acts 21:37 · Berean Standard Bible
As they were about to take Paul into the barracks, he asked the commander, “May I say something to you?” “Do you speak Greek?” he replied.
Context
35Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu. 36Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!” 37Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?”
Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik? 38Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?” 39Pọl sịrị, “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.