Native Bible

Acts 21:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”

Acts 21:25 in English

Acts 21:25 · Berean Standard Bible

As for the Gentile believers, we have written to them our decision that they must abstain from food sacrificed to idols, from blood, from the meat of strangled animals, and from sexual immorality.”

Context

23Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke. 24Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu. 25Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.” 26Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ. 27Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.