Native Bible

Acts 21:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ.

Acts 21:18 in English

Acts 21:18 · Berean Standard Bible

The next day Paul went in with us to see James, and all the elders were present.

Context

16Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ. 17Mgbe anyị rutere Jerusalem, ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị. 18Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ. 19Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile Chineke rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya. 20Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.