Ọrụ Ndị Ozi 20:8
Acts 20:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ.
Acts 20:8 in English
Acts 20:8 · Berean Standard Bible
Now there were many lamps in the upper room where we were gathered.
Context
6Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa. 7Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị. 8Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ. 9Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ. 10Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.