Ọrụ Ndị Ozi 20:37
Acts 20:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ.
Acts 20:37 in English
Acts 20:37 · Berean Standard Bible
They all wept openly as they embraced Paul and kissed him.
Context
35Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ” 36Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere. 37Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ. 38O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.