Native Bible

Acts 20:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.

Acts 20:2 in English

Acts 20:2 · Berean Standard Bible

After traveling through that area and speaking many words of encouragement, he arrived in Greece,

Context

1Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia. 2Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis. 3Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi. 4Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.