Native Bible

Acts 20:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.

Acts 20:18 in English

Acts 20:18 · Berean Standard Bible

When they came to him, he said, “You know how I lived the whole time I was with you, from the first day I arrived in the province of Asia.

Context

16Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime. 17Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya. 18Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a. 19Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m. 20Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.