Native Bible

Acts 19:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya.

Acts 19:31 in English

Acts 19:31 · Berean Standard Bible

Even some of Paul’s friends who were officials of the province of Asia * sent word to him, begging him not to venture into the theatre.

Context

29Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ. 30Pọl chọrọ ịbakwuru igwe mmadụ ahụ, ma ndị na-eso ụzọ ahụ ekweghị ya. 31Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya. 32Ugbu a, nzukọ ahụ na-agba aghara, ụfọdụ mmadụ na-eti mkpu otu ihe, ndị ọzọ na-eti ihe ọzọ. Nʼezie, ọtụtụ nʼime ha amatakwaghị ihe ha jiri nọdụ nʼebe ahụ. 33Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.