Ọrụ Ndị Ozi 18:6
Acts 18:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.”
Acts 18:6 in English
Acts 18:6 · Berean Standard Bible
But when they opposed and insulted him, he shook out his garments and told them, “Your blood be on your own heads! I am innocent of it. From now on I will go to the Gentiles.”
Context
4Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere. 5Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ. 6Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.” 7O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu. 8Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.