Native Bible

Acts 18:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs.

Acts 18:21 in English

Acts 18:21 · Berean Standard Bible

But as he left, he said, “I will come back * to you if God is willing.” And he set sail from Ephesus.

Context

19Mgbe ha rutere Efesọs, ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ, ma o bu ụzọ banye nʼụlọ nzukọ ebe ya na ndị Juu nwere mkparịta ụka. 20Ma mgbe ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụkwuoro ha ogologo oge, ọ kweghị. 21Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs. 22Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk. 23Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.