Ọrụ Ndị Ozi 17:8
Acts 17:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile.
Acts 17:8 in English
Acts 17:8 · Berean Standard Bible
On hearing this, the crowd and city officials were greatly disturbed.
Context
6Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu. 7Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.” 8Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile. 9Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha. 10Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.