Native Bible

Acts 16:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas.

Acts 16:8 in English

Acts 16:8 · Berean Standard Bible

So they passed by Mysia and went down to Troas.

Context

6Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ. 7Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa. 8Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas. 9Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.” 10Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.