Native Bible

Acts 16:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”

Acts 16:36 in English

Acts 16:36 · Berean Standard Bible

The jailer informed Paul: “The magistrates have sent orders to release you. Now you may go on your way in peace.”

Context

34Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke. 35Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.” 36Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.” 37Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.” 38Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.