Native Bible

Acts 16:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe,* pịakwa ha ihe.

Acts 16:22 in English

Acts 16:22 · Berean Standard Bible

The crowd joined in the attack against Paul and Silas, and the magistrates ordered that they be stripped and beaten with rods.

Context

20Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị, 21site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.” 22Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe,* pịakwa ha ihe. 23Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma. 24Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.