Ọrụ Ndị Ozi 16:12
Acts 16:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị.
Acts 16:12 in English
Acts 16:12 · Berean Standard Bible
From there we went to the Roman colony of Philippi, the leading city of that district of Macedonia.* And we stayed there several days.
Context
10Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma. 11Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis. 12Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị. 13Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu. 14Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.