Native Bible

Acts 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị.

Acts 11:4 in English

Acts 11:4 · Berean Standard Bible

But Peter began and explained to them the whole sequence of events:

Context

2Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta, 3na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?” 4Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị. 5“Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m. 6Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.