Ọrụ Ndị Ozi 11:28
Acts 11:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị.
Acts 11:28 in English
Acts 11:28 · Berean Standard Bible
One of them named Agabus stood up and predicted through the Spirit that a great famine would sweep across the whole world.* (This happened under Claudius.)
Context
26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst. 27Nʼoge ahụ, ndị amụma sitere na Jerusalem bịaruru Antiọk. 28Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị. 29Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike. 30Ha mere nke a, ha zigara ndị okenye ihe ha tụkọtara, site nʼaka Banabas na Sọl.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.