Native Bible

Acts 11:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita.

Acts 11:13 in English

Acts 11:13 · Berean Standard Bible

He told us how he had seen an angel standing in his house and saying, ‘Send to Joppa for Simon who is called Peter.

Context

11“Nʼotu oge ahụ, ndị ikom atọ ndị e zipụrụ site Sizaria ịkpọ m bịarutere kwụsị nʼọnụ ụzọ nʼụlọ ebe m nọ. 12Mmụọ Nsọ gwara m ka m ghara inwe obi abụọ isoro ha na-akpaghị oke ọbụla. Mmadụ isii ndị a nʼetiti ụmụnna anyị sokwa m, bịarute nʼụlọ nwoke ahụ. 13Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita. 14Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’ 15“Mgbe m ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dịka o siri bịakwasị anyị na mbụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.