Ọrụ Ndị Ozi 10:21
Acts 10:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?”
Acts 10:21 in English
Acts 10:21 · Berean Standard Bible
So Peter went down to the men * and said, “Here am I, the one you are looking for. Why have you come?”
Context
19Ka Pita nọrịị na-atụgharị uche nʼihe ọhụ ahụ pụtara, Mmụọ Nsọ gwara ya, “Lee, mmadụ atọ guzo nʼọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị. 20Bilie, rịda jekwuru ha ngwangwa, enwela obi abụọ ị soro ha gawa, nʼihi na ọ bụ m zitere ha.” 21Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?” 22Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.” 23Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.