Native Bible

Acts 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”

Acts 1:11 in English

Acts 1:11 · Berean Standard Bible

“Men of Galilee,” they said, “why do you stand here looking into the sky? This same Jesus, who has been taken from you into heaven, will come back in the same way you have seen Him go into heaven.”

Context

9Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha. 10Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. 11Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.” 12Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem. 13Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.