3 Jọn 1:8
3 John 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.
3 John 1:8 in English
3 John 1:8 · Berean Standard Bible
Therefore we ought to support such men, so that we may be fellow workers for the truth.
Context
6Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto. 7Ọ bụ nʼihi aha* ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe. 8Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ. 9Edere m akwụkwọ ozi zigara nzukọ ahụ, ma Diotrefis onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye mbụ, anabataghị anyị nke ọma. 10Ya mere, ọ bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile ọ na-eme na ọtụtụ ihe niile ọ na-ekwu megide anyị pụta ìhè. Ọ bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, ọ jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. Ọ na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.