Native Bible

2 Timothy 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ.

2 Timothy 3:9 in English

2 Timothy 3:9 · Berean Standard Bible

But they will not advance much further. For just like Jannes and Jambres, their folly will be plain to everyone.

Context

7Ndị a na-akụziri ihe oge niile, ma ha apụghị inweta amamihe nke eziokwu. 8Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosis ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị. 9Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ. 10Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m, 11na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼAntiọk, na Aikoniọm, na Listra. Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma Onyenwe anyị napụtara m site nʼime ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.