2 Timoti 3:1
2 Timothy 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ.
2 Timothy 3:1 in English
2 Timothy 3:1 · Berean Standard Bible
But understand this: In the last days terrible times will come.
Context
1Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ. 2Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. 3Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.