Native Bible

2 Thessalonians 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha.

2 Thessalonians 2:9 in English

2 Thessalonians 2:9 · Berean Standard Bible

The coming of the lawless one will be accompanied by the working of Satan, with every kind of power, sign, and false wonder,

Context

7Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya. 8Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya. 9Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha. 10Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta. 11Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.