Native Bible

2 Thessalonians 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya.

2 Thessalonians 1:5 in English

2 Thessalonians 1:5 · Berean Standard Bible

All this is clear evidence of God’s righteous judgment. And so you will be counted worthy of the kingdom of God, for which you are suffering.

Context

3Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa. 4Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu. 5Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya. 6Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu. 7Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.